elekere 5 gara aga

Father Ejike Mbaka ekwuola na ụfọdụ ndị gara nga na Naijiria dịka Orji Uzor Kalu gatara ihe ọma

Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu na-achịkọta Adoration Ministries n’Enugwu steeti ekwuola na ụfọdụ ndị gara nga na Naijiria dika Orji Uzor Kalu, agatala ihe ọma.

Fada Mbaka kwuru nke a dịka o bidokwara ekpere Adoration ya ọ kwụsịrị mgbe mkpamkpa ọrịa coronavirus mechiri ya, taa bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Julaị.

Ụbọchị a dabakwara n’ụbọchị mere ya afọ 25 e chiri ya ụkọchukwu.

Na-ataghị okwu arụ, o kwuru na ọtụtụ ndị gara ụlọmkpọrọ na Naijiria gatara ihe ọma ebe ụfọdụ n’ime ha pụtara bụrụ eze.

O kwuru na Orji Uzor Kalu zitere ya ozi ekele na ya agbaala afọ 25 n’ọrụ ụkọchukwu, ma kwuo na mkpọrọ ya bụ nwoke gara ga-ebutere ya ihe ọma.

O jiri ndị chịburu Naijira dịka Olusegun Obasanjo, onyeisiala nakwa Joseph nke Akwụkwọ Nsọ maa atụ, wee kwubie na ịga mkpọrọ bụ otu ụzọ esi eme mmadụ eze.

Taa mere ya afọ 25 e chiri Fada Mbaka ụkọchukwu

Bishọp Enugwu Diocese nwụrụ anwụ bụ Michael Eneje chiri Fada Ejike Mbaka ụkọchukwu ụka Katọlik n’ụbọchị 29 Julaị n’afọ 1995.

Mbaka bidoro ekpere Adoration ya na-ewu ewu taa iji mee mmemme ncheta ụkọchukwu ya, ma werekwa ohere ahụ malite ekpere ọzọ kemgbe Coronavirus mere ka a kwụsị ya.

N’ogige Adoration ahụ dị n’Umuchigbo, Iji Nike, adọtara ogige ebe ndị mmadụ na-akwọ aka ma mekwaa ka oche ndị mmadụ rube isi n’iwu nnọsapụ nke Bekee kpọrọ “social distancing”.

Mbaka ji ohere ahụ kpeere ndị Naịjiria nakwa ụwa niile ekpere ka ọrịa coronavirus laa n’igwenga ebe o siri bịa.

Read original article here.